Psalms 34

Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ.

Chineke dị mma

1Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile.
Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.
2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị;
ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.
3Soro m too Onyenwe anyị;
ka anyị bulie aha ya elu.

4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m,
napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe;
ihere adịghị eme ha.
6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya;
ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.
7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu
na-anapụtakwa ha.

8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma;
onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
9Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya,
nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
10Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha,
ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
11Ụmụ m, bịanụ gee m ntị;
aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.
12Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya,
ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
13chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,
chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
14Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe,
chọọ udo ma gbasookwa ya.

15Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,
ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;
16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,
ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.

17 Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;
ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
18 Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,
ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.

19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu,
ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam.
Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.

21Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ;
ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.
22 Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya;
ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.
Copyright information for IboBIU